23Emesịa, mgbe ọ ghọrọ nna Nahọ, ọ dịrị ndụ narị afọ abụọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
24Nahọ gbara iri afọ abụọ na itoolu mgbe ọ mụrụ Tera.
25Emesịa, mgbe ọ ghọrọ nna Tera, ọ dịrị ndụ narị afọ na afọ iri na itoolu ọzọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
26Mgbe Tera gbara iri afọ asaa, ọ ghọrọ nna Ebram, Nahọ na Haran.
27Nke a bụ akụkọ gbasara usoro ezinaụlọ Tera. Tera ghọrọ nna Ebram, Nahọ na Haran. Haran ghọrọ nna Lọt.