26Mgbe Tera gbara iri afọ asaa, ọ ghọrọ nna Ebram, Nahọ na Haran.
27Nke a bụ akụkọ gbasara usoro ezinaụlọ Tera. Tera ghọrọ nna Ebram, Nahọ na Haran. Haran ghọrọ nna Lọt.
28Haran nwụrụ nʼihu nna ya Tera nʼala ebe a nọ mụọ ya, nke bụ na Ụọ, obodo ndị Kaldịa.
29Ebram na Nahọ lụrụ nwunye. Aha nwunye Ebram bụ Serai ma aha nwunye Nahọ bụ Milka. Milka bụ nwa Haran, onye bụ nna Milka na Iska.
30Ma Serai bụ nwanyị aga, ọ mụtaghị nwa ọbụla.