30Ma Serai bụ nwanyị aga, ọ mụtaghị nwa ọbụla.
31Tera kpọrọ nwa ya Ebram, na nwa nwa ya Lọt, onye bụ nwa Haran, na nwunye nwa ya Serai, bụ nwunye Ebram, duru ha hapụ Ụọ, obodo ndị Kaldịa, pụọ gawa nʼala Kenan. Ma mgbe ha bịarutere nʼobodo Haran, ha kwụsịrị biri nʼebe ahụ.
32Ọ bụ nʼobodo Haran ka Tera nọ nwụọ, mgbe ọ gbara narị afọ abụọ na ise.