5Onyenwe anyị rịdatara hụ obodo ahụ na ụlọ elu ahụ ndị mmadụ na-ewu.
6Onyenwe anyị sịrị, “Lee! Ọ bụrụ na ha malitere ime ihe dị otu a, ugbu a ha bụ otu ndị, nweekwa otu asụsụ, o nweghị ihe ha zubere ime nke ha na-apụghị ime.
7Ngwa, ka anyị rịda gaa gbarụọ asụsụ ha, ka onye o bụla ghara ịghọta asụsụ ibe ya.”
8Onyenwe anyị mere ka ha gbasaa nʼelu ụwa niile. Ha kwụsịkwara iwu obodo ahụ.
9Ọ bụkwa nke a mere e ji kpọọ obodo ahụ Babel nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị wetara ọgbaaghara nʼasụsụ ndị niile bi nʼụwa. Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị si gbasasịa ha nʼelu ụwa dum.