8Ya mere Ebram gwara Lọt sị, “Biko, ka esemokwu ghara ịdị nʼetiti mụ na gị, maọbụ nʼetiti ndị ọzụzụ anụ ụlọ m na ndị ọzụzụ anụ ụlọ gị, nʼihi na anyị bụ ụmụnne.
9Lee, ọ bụ na ala a niile adịghị nʼihu gị? Ka anyị kewaa. Ọ bụrụ na ị gaa nʼakụkụ aka ekpe, aga m aga nʼakụkụ aka nri. Ma ọ bụrụ na i gaa nʼakụkụ aka nri gị, aga m aga nʼakụkụ aka ekpe.”
10Lọt lelitere anya hụ na mbara ala Jọdan bụ ala mmiri na-ezokwasị nke ọma, ala dịka ubi a gbara ogige Onyenwe anyị, dịka ala ndị Ijipt nke dị na nso nso Zoa. (Ihe a mere tupu Onyenwe anyị ebibie obodo Sọdọm na Gọmọra.)
11Ya mere, Lọt họọrọ nye onwe ya mbara ala Jọdan niile, chee ihu ịga nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ. Ya na Ebram kewara.
12Ebram nọdụrụ nʼala Kenan, ma Lọt gara biri nʼetiti obodo ndị ahụ dị na mbara ala. Ọ mara ụlọ ikwu ya nso nso obodo Sọdọm.