6na ndị Hor nʼobodo ugwu Sia, ruo obodo El Paran, nke dị nʼakụkụ ọzara.
7Mgbe ahụ, ha chigharịrị azụ gaa En Mishpat (ya bụ Kadesh). Ha meriri ala niile nke ndị Amalek nakwa ndị Amọrait bi na Hazezọn Tama.
8Mgbe ahụ kwa, ndị agha ndị eze obodo Sọdọm na eze Gọmọra, na eze Adma, na eze Zeboiim, na eze Bela (ya bụ Zoa) pụrụ doo onwe ha nʼusoro ibu agha na Ndagwurugwu Sidim,
9imegide Kedoloma eze Elam, Tidal eze Goiim, Amrafel eze Shaịna na Ariok eze Elasa. Ya bụ eze ise buru agha megide eze anọ.
10Ma Ndagwurugwu Sidim jupụtara nʼolulu apịtị. Mgbe ndị agha eze Sọdọm na Gọmọra bidoro ịgba ọsọ. Ụfọdụ nʼime ha dabanyere nʼime olulu ndị a, ma ndị fọdụrụ gbapụrụ ọsọ gbaga nʼugwu.