23Nʼụbọchị ahụ, Ebraham duuru Ishmel nwa ya nwoke, na ndị ikom niile a mụrụ nʼezinaụlọ ya, tinyere ndị e ji ego zụta, ndị ikom niile nọ nʼezinaụlọ ya, bie ha ugwu dịka Chineke gwara ya ka ọ mee.
24Ebraham gbara iri afọ itoolu na itoolu mgbe e biri ya ugwu,
25Ishmel nwa ya gbara afọ iri na atọ.
26E biri Ebraham na nwa ya bụ Ishmel ugwu nʼotu ụbọchị ahụ.
27Ndị ikom niile nọ nʼezinaụlọ Ebraham, ndị a mụrụ nʼụlọ ya na ndị e si nʼaka ndị mba ọzọ zụta ka e biri ugwu nʼoge Ebraham biri ugwu.