1Mgbe Ebram gbara iri afọ itoolu na itoolu, Onyenwe anyị gosiri ya onwe ya sị ya, “Abụ m Chineke Onye pụrụ ime ihe niile. Jegharịa ije nʼihu m, bụrụ onye na-enweghị ịta ụta ọbụla.
2Aga m eme ka ọgbụgba ndụ m dịrị nʼetiti mụ na gị, mekwa ka ị mụbaa nke ukwuu nʼọnụọgụgụ.”
3Ebram dara nʼala, kpudo ihu ya nʼala. Chineke gwara ya sị,
4“Lee, nke a bụ ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na gị. Ị ga-abụ nna ọtụtụ mba.
5Aha gị agaghị abụkwa Ebram, kama ọ ga-abụ Ebraham, nʼihi na emeela m gị nna nke ọtụtụ mba.