5Aha gị agaghị abụkwa Ebram, kama ọ ga-abụ Ebraham, nʼihi na emeela m gị nna nke ọtụtụ mba.
6Aga m eme gị ka ị mụbaa nke ukwuu. Aga m eme ka ị ghọọ ọtụtụ mba dị iche iche, ndị eze ga-esitekwa na gị pụta.
7Aga m eme ka ọgbụgba ndụ mụ na gị gbara guzosie ike, ka ọ dịkwara ụmụ ụmụ ndị ga-esote gị nʼọgbọ niile na-abịa. Ọ bụ ọgbụgba ndụ na-egosi na m bụ Chineke gị, na Chineke ụmụ ụmụ gị niile ga-eso gị.
8Ala Kenan niile, ebe ị nọ ugbu a dịka ọbịa ka m ga-enye gị na ụmụ ụmụ gị ga-esote gị dịka ihe nketa ebighị ebi. Aga m abụ Chineke ha.”
9Chineke gwara Ebraham okwu sị ya, “Ma nʼebe ị nọ, ị ghaghị irube isi imezu ihe ọgbụgba ndụ m kwuru, gị onwe gị na ụmụ ụmụ gị ndị ga-esote gị, ruo ọgbọ niile.