Jenesis 19

Ya mere, Lọt pụrụ gaa gwa ndị ọgọ ya nwoke, ndị na-akwado ịlụ ụmụ ya ndị inyom, sị ha, “Ọsọ, sinụ nʼobodo a pụọ. Nʼihi na Onyenwe anyị na-akwado ibibi ya.” Ma ndị ọgọ ya nwoke ndị a chere na ọ na-egwu egwu.

Genesis 19:14 (UKJV) And Lot went out, and spoke unto his sons in law, which married his daughters, and said, Up, get you out of this place; for the LORD will destroy this city. But he seemed as one that mocked unto his sons in law.

12Ndị ikom abụọ ahụ gwara Lọt sị, “O nwere onye ọbụla ọzọ i nwere nʼebe a? Ndị ọgọ nwoke, maọbụ ụmụ gị ndị ikom, maọbụ ụmụ gị ndị inyom, na ọ bụ onye ọbụla bụ nke gị nʼobodo a. Site nʼebe a kpọpụ ha!

13Nʼihi na anyị na-aga imebi obodo a, mkpu akwa ruru Onyenwe anyị ntị megide ndị bi nʼobodo a adịla ukwuu, nke mere o ji zite anyị ibibi ya.”

14Ya mere, Lọt pụrụ gaa gwa ndị ọgọ ya nwoke, ndị na-akwado ịlụ ụmụ ya ndị inyom, sị ha, “Ọsọ, sinụ nʼobodo a pụọ. Nʼihi na Onyenwe anyị na-akwado ibibi ya.” Ma ndị ọgọ ya nwoke ndị a chere na ọ na-egwu egwu.

15Nʼụtụtụ, mgbe chi na-abọta, ndị mmụọ ozi a kwagidere Lọt sị ya, “Ọsọ, kpọrọ nwunye gị na ụmụ gị ndị inyom abụọ ndị a site nʼebe a gbapụ, ma ọ bụghị ya, a ga-ekpochapụ unu nʼihi ajọ omume ndị obodo a.”

16Mgbe Lọt ka nọ na-eche ihe ọ ga-eme, ndị ikom ahụ jidere ya nʼaka, jidekwa nwunye ya, na ụmụ ya ndị inyom abụọ duru ha pụọ nʼobodo ahụ, nʼihi na Onyenwe anyị nwere obi ebere nʼebe ha nọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.