35Ha mere ka nna ha ṅụọ mmanya nʼabalị ahụ, ada ya nke nta banyere ya na nna ya dinaa. Dịka ọ dịkwa na mbụ, nna ha amataghị mgbe o dinara ala maọbụ mgbe o bilitere.
36Ya mere, ụmụ ndị inyom Lọt abụọ ndị a tụrụ ime site nʼaka nna ha.
37Nke ada mụtara nwa nwoke onye ọ gụrụ Moab. Ọ bụ ya bụ nna nna ndị Moab ruo taa.
38Nwa ya nke nta mụtakwara nwa nwoke onye ọ gụrụ Ben-Ammi. Ọ bụ ya bụ nna nna ndị Amọn ruo taa.