10E nwere iyi si nʼIden na-asọpụta na-asọbanye nʼime ogige ahụ ime ka ala ahụ nwee mmiri. Site nʼebe ahụ, iyi a kewara nwee ngalaba anọ.
11Aha ngalaba nke mbụ bụ Paịshọn. Ọ sọọrọ ogologo gafee ala niile nke Havila, ebe a na-enweta ọlaedo.
12(Ọlaedo dị nʼala ahụ mara mma. Eso osisi na-esi isi ụtọ na nkume dị oke ọnụahịa a na-akpọ ọniks dịkwa nʼebe ahụ.)
13Aha ngalaba nke abụọ bụ Gaihọn. O sitere nʼala Kush gafee.
14Aha osimiri nke atọ bụ Taịgris. Ọ na-asọla nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ala Ashọ. Aha osimiri nke anọ bụ Yufretis.