16Onyenwe anyị Chineke nyere mmadụ ahụ iwu sị ya “I nwere ike iri mkpụrụ osisi niile dị nʼubi a,
17ma ị gaghị eri mkpụrụ si nʼosisi ịmata ihe ọma na ihe ọjọọ. Nʼihi na ụbọchị i riri ya ị ga-anwụrịrị.”
18Onyenwe anyị Chineke kwuru sị, “Ọ dịghị mma ka nwoke nọrọ naanị ya. Aga m emere ya onye inyeaka nke kwesiri ya.”
19Onyenwe anyị Chineke sitere nʼala kpụọ ụmụ anụmanụ niile nke ọhịa na ụmụ anụ ufe niile nke eluigwe. O dutere ha ka ọ mara ihe mmadụ ahụ ga-akpọ ha. Ihe ọbụla mmadụ ahụ kpọrọ ihe ọbụla ndị a nwere ndụ, nke ahụ bụkwa aha ya.
20Ya mere, mmadụ ahụ nyere anụ ụlọ niile na anụ ufe niile na anụ ọhịa niile aha. Ma nʼebe Adam nọ, o nweghị onye inyeaka kwesiri ya.