1Otu a ka e si rụzuo ọrụ ike eluigwe na ụwa na ihe niile dị nʼime ha.
2Nʼụbọchị nke asaa, Chineke kwụsịrị ọrụ ya nke ọ na-arụ, o zukwara ike site nʼọrụ ya niile.
3Chineke gọziri ụbọchị nke asaa ahụ mee ya ka ọ bụrụ ụbọchị dị nsọ, nʼihi na ọ bụ nʼụbọchị ahụ ka ọ zuru ike site nʼọrụ nke ike ihe niile.
4Nke a bụ akụkọ banyere usoro okike eluigwe na ụwa mgbe e kere ha, nʼụbọchị ahụ mgbe Onyenwe anyị Chineke kere eluigwe na ụwa.
5Ahịhịa ọbụla epupụtabeghị nʼọhịa, o nwekwaghị ihe ubi ọbụla sitere nʼala pupụta, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke ezitebeghị mmiri ozuzo nʼelu ụwa, o nwekwaghị mmadụ ọbụla nọ na-arụ ọrụ ubi,