4Nke a bụ akụkọ banyere usoro okike eluigwe na ụwa mgbe e kere ha, nʼụbọchị ahụ mgbe Onyenwe anyị Chineke kere eluigwe na ụwa.
5Ahịhịa ọbụla epupụtabeghị nʼọhịa, o nwekwaghị ihe ubi ọbụla sitere nʼala pupụta, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke ezitebeghị mmiri ozuzo nʼelu ụwa, o nwekwaghị mmadụ ọbụla nọ na-arụ ọrụ ubi,
6ma mmiri si nʼala na-asọpụta na-asọ nʼelu ala niile.
7Onyenwe anyị Chineke kpụrụ mmadụ site nʼaja nke ala, kunye ya ume ndụ nʼimi ya, nke mere ka mmadụ ghọọ ihe dị ndụ.
8Onyenwe anyị Chineke kụrụ ubi a gbara ogige nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, nʼIden. O tinyere mmadụ ahụ ọ kpụrụ nʼime ubi a.