Jenesis 22

Nʼisi ụtụtụ echi ya, Ebraham biliri kwadoo ịnyịnya ibu ya. O duuru ndị ikom abụọ na-ejere ya ozi, na nwa ya nwoke Aịzik. O gbutere nkụ ga-ezuru ya ịchụ aja nsure ọkụ, bilie gawa ebe ahụ Chineke gwara ya maka ya.

Genesis 22:3 (UKJV) And Abraham rose up early in the morning, and saddled his ass, and took two of his young men with him, and Isaac his son, and clave the wood for the burnt offering, and rose up, and went unto the place of which God had told him.

1Mgbe ihe ndị a gasịrị, Chineke nwara Ebraham. Ọ sịrị ya, “Ebraham.” Ebraham zara sị, “Lekwa m.”

2Chineke sịrị, “Duru nwa gị nwoke, naanị otu nwa gị nwoke, Aịzik onye ị hụrụ nʼanya, gaa nʼala Mọrịa. Jiri ya chụọrọ m aja nsure ọkụ nʼelu otu nʼime ugwu dị nʼebe m ga-egosi gị.”

3Nʼisi ụtụtụ echi ya, Ebraham biliri kwadoo ịnyịnya ibu ya. O duuru ndị ikom abụọ na-ejere ya ozi, na nwa ya nwoke Aịzik. O gbutere nkụ ga-ezuru ya ịchụ aja nsure ọkụ, bilie gawa ebe ahụ Chineke gwara ya maka ya.

4Nʼụbọchị nke atọ, Ebraham lepụrụ anya hụ ebe ahụ nʼebe dị anya.

5Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi sị, “Nọdụnụ nʼebe a, unu na ịnyịnya ibu anyị, ka mụ na nwokorobịa a gaa nʼebe ahụ. Anyị feecha ofufe, anyị ga-alọghachikwute unu ọzọ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.