10Efrọn onye Het nʼonwe ya so nọdụ nʼebe ahụ nʼetiti ndị ya. Ọ zara Ebraham nʼihu ndị Het niile bịara nʼọnụ ụzọ ama obodo
11sị ya, “Mba! Nna m ukwu, gee m ntị. Ana m enye gị ala ahụ na ọgba dị nʼime ya nʼihu ndị a niile bụ ndị m. Gaa lie onye gị nwụrụ anwụ nʼime ya.”
12Ọzọ Ebraham kpọrọ isiala nye ndị nwe ala,
13ọ sịrị Efrọn, nʼihu ha niile, “Biko gee m ntị, aga m akwụ gị ọnụahịa iji zụọ ala ahụ. Nara m ya ka m nwee ike lie onye m nwụrụ anwụ nʼime ya.”
14Efrọn zara Ebraham,