13Lee, ana m eguzo nʼakụkụ isi iyi mmiri a, ụmụ nwanyị ndị obodo a na-abịa iseta mmiri.
14Kwere ka o si otu a dịrị na nwaagbọghọ nke m ga-asị, ‘Biko, zie ite gị ka m ṅụrụ mmiri.’ Ọ bụrụ na onye ahụ asị m, ‘Ṅụọ, aga m ekutekwa mmiri nke ịnyịnya kamel gị ga-aṅụ,’ ka onye ahụ bụrụ onye ị họpụtara ohu gị Aịzik. Nʼụzọ dị otu a ka m ga-esi mata na i gosila nna m ukwu obi ebere.”
15Tupu o kpechaa ekpere a, lekwa Ribeka ada Betuel, nwa nwoke Milka, onye bụ nwunye Nahọ, nwanne Ebraham. Ọ na-apụta bukwasị ite nʼubu ya.
16Ọ bụ nwaagbọghọ mara mma nke ukwuu, onye na-amatabeghị nwoke, nke nwoke ọbụla na-edinabeghị. Ọ gara nʼolulu mmiri kujuo ite ya si nʼebe ahụ na-arịgopụta.
17Ohu ahụ mere ngwangwa jekwuru ya sị ya, “Biko nyetụ m mmiri si nʼite mmiri gị.”