50Leban na Betuel zara sị ya, “Ihe niile si nʼaka Onyenwe anyị. Anyị enweghị ike ịgwa gị okwu ọjọọ maọbụ nke ọma.
51Lee Ribeka, kpọrọ ya laa, ka ọ bụrụ nwunye nwa nna gị ukwu, dịka Onyenwe anyị kwuru.”
52Mgbe ohu Ebraham nụrụ ihe ha kwuru, ọ dara nʼala kpọọ isiala nye Onyenwe anyị.
53Mgbe ahụ kwa, ohu ahụ wepụtara ihe ịchọ mma ọlaedo, na ọlaọcha dị iche iche na uwe nye ha Ribeka. Ọ wepụtakwara onyinye ndị ọzọ dị oke ọnụahịa nye nwanne ya nwoke na nne ya.
54Emesịa, mgbe ihe ndị a gasịrị, ya na ndị ikom so ya riri, ṅụọ, dinaakwa nʼabalị ahụ. Mgbe ha si nʼụra teta, o kwuru sị, “Zilaga m ka m lakwuru nna m ukwu.”