53Mgbe ahụ kwa, ohu ahụ wepụtara ihe ịchọ mma ọlaedo, na ọlaọcha dị iche iche na uwe nye ha Ribeka. Ọ wepụtakwara onyinye ndị ọzọ dị oke ọnụahịa nye nwanne ya nwoke na nne ya.
54Emesịa, mgbe ihe ndị a gasịrị, ya na ndị ikom so ya riri, ṅụọ, dinaakwa nʼabalị ahụ. Mgbe ha si nʼụra teta, o kwuru sị, “Zilaga m ka m lakwuru nna m ukwu.”
55Ma Leban na nne ya zara sị ya, “Ka nwantakịrị nwanyị a nọnyere anyị ihe dịka ụbọchị iri tupu o soro gị laa.”
56Ma ọ zara ha sị, “Unu egbochila anyị. Ebe ọ bụ na Onyenwe anyị emeela ka ije m bụrụ ihe gara nke ọma, zilaga m ka m laghachikwuru nna m ukwu.”
57Ha zara sị ya, “Ka anyị kpọọ nwantakịrị nwanyị ahụ jụọ ya ihe bụ uche ya.”