58Ya mere ha kpọrọ Ribeka jụọ ya sị, “Ị ga-eso nwoke a gaa?” Ọ zara sị, “E, aga m aga.”
59Ya mere, ha zipụrụ nwanne ha nwanyị Ribeka, tinyere nwanyị lekọtara ya anya mgbe ọ dị na nwantakịrị, na ohu Ebraham na ndị ikom so ya.
60Ha gọziri Ribeka sị ya, “Nwanne anyị nwanyị mụọ ọmụmụ, mụruo puku kwụrụ puku, ka mkpụrụ afọ gị nwetara onwe ha, ọnụ ụzọ ama ndị iro ha.”
61Ribeka biliri, ya na ndị inyom na-ejere ya ozi, ha rigoro nʼelu ịnyịnya kamel ndị ahụ, soro nwoke ahụ. Ya mere, ohu ahụ duuru Ribeka laa.
62Nʼoge a, Aịzik bịara nʼebe mbata obodo Bịa-Lahai-Rọị nʼihi na o bi na Negev.