11Ya mere, Abimelek nyere ndị niile ya iwu, sị ha, “Onye ọbụla metụrụ nwoke a maọbụ nwunye ya aka, aghaghị ime ka ọ nwụọ.”
12Aịzik kụrụ mkpụrụ ubi nʼala ahụ. Nʼotu afọ ahụ kwa, o si nʼala ahụ webata ihe ubi narị okpukpu karịa nke ọ kụrụ, nʼihi na Onyenwe anyị gọziri ya.
13Nwoke a bara ụba, ghọọ ọgaranya. Akụnụba ya gara nʼihu na-amụba, tutu ruo mgbe ọ ghọrọ nnọọ onye ọgaranya a ma ama.
14O nwere ọtụtụ igwe anụ ụlọ, na igwe ehi, na ndị ikom na-ejere ya ozi. Nʼihi ihe ndị a, ndị Filistia bidoro inwe anya ukwu megide ya.
15Ndị Filistia wụjuru aja nʼolulu mmiri ndị ahụ niile ndị na-ejere nna ya ozi gwuru nʼoge nna ya Ebraham dị ndụ.