Jenesis 26

Ha sị, “Anyị hụrụ nke ọma na Onyenwe anyị nọnyeere gị, ya mere anyị ji sị, ‘O kwesiri ka ịṅụ iyi dị nʼetiti anyị na gị,’ ka anyị na gị gbaakwa ndụ

Genesis 26:28 (UKJV) And they said, We saw certainly that the LORD was with you: and we said, Let there be now an oath between us, even between us and you, and let us make a covenant with you;

26Abimelek na Ahuzat, onye ndụmọdụ ya, na Fikọl onyeisi ndị agha ya sitere Gera jekwuru Aịzik.

27Aịzik jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji bịakwute m, ebe ọ bụ na unu kpọrọ m asị, chụpụkwa m site nʼetiti unu?”

28Ha sị, “Anyị hụrụ nke ọma na Onyenwe anyị nọnyeere gị, ya mere anyị ji sị, ‘O kwesiri ka ịṅụ iyi dị nʼetiti anyị na gị,’ ka anyị na gị gbaakwa ndụ

29na ị gaghị eme anyị ihe ọjọọ dịka anyị na-esighị mee gị ihe ọjọọ. I lezie anya nke ọma, ị ga-ahụ na anyị meere gị ihe ọma mgbe anyị hapụrụ gị ka ị laa nʼudo. Ugbu a, anyị maara na ị bụ onye Onyenwe anyị gọziri agọzi.”

30Aịzik meere ha mmemme nri dị ukwuu; ha riri, ṅụọkwa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.