19Ọ kpọrọ ebe ahụ Betel, ọ bụ ezie na Luz bụ aha obodo ahụ na mbụ.
20Mgbe ahụ, Jekọb kwere nkwa sị, “Ọ bụrụ na Chineke ga-anọnyere m, chebe m nʼije m na-eje, ọ bụrụ na ọ ga-enye m ihe oriri m ga-eri na uwe m ga-eyi,
21m lọghachi nʼụlọ nna m nʼudo, mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-abụ Chineke m.
22Nkume a m doziri elu dịka ogidi ga-abụ ụlọ Chineke. Aga m eke ihe niile i nyere m ụzọ iri, nyeghachi gị otu ụzọ.”