9Mgbe Jekọb na ndị ọzụzụ atụrụ ndị a kpụ okwu nʼọnụ, Rechel chịịrị atụrụ nna ya bịakwute ha, nʼihi na onye ọzụzụ atụrụ nwanyị ka ọ bụ.
10Mgbe Jekọb hụrụ Rechel nwa Leban nwanne nne ya, hụkwa igwe atụrụ Leban, ọ meghepụrụ nkume ahụ e ji mechie ọnụ olulu mmiri ahụ nye igwe atụrụ Leban, nwanne nne ya mmiri ka ha ṅụọ.
11Emesịa, Jekọb suturu Rechel ọnụ, kwaa akwa nʼoke olu.
12Jekọb kọwaara Rechel na ọ bụ onye ikwu nna ya, bụrụkwa nwa Ribeka. Nʼihi ya Rechel ji ọsọ gbalaa nʼụlọ ha kọọrọ nna ya.
13Mgbe Leban nụrụ maka Jekọb nwa nwanne ya nwanyị, o mere ngwangwa pụọ izute ya. Ọ makụrụ ya, sutu ya ọnụ, kpọrọ ya laa nʼụlọ. Nʼebe ahụ, Jekọb kọọrọ ya ihe ndị a niile.