Jenesis 29

Mgbe Onyenwe anyị hụrụ na Lịa bụ nwanyị a kpọrọ asị, o meghere akpanwa ya, ma Rechel bụ nwanyị aga.

Genesis 29:31 (UKJV) And when the LORD saw that Leah was hated, he opened her womb: but Rachel was barren.

29Leban nyere nwa ya nwanyị, Rechel, odibo ya nwanyị bụ Bilha, ka ọ bụrụ odibo ya.

30Jekọb bakwukwara Rechel. Ọ hụrụ Rechel nʼanya nke ukwuu karịa Lịa. Ọ gbakwaara Leban odibo afọ asaa ọzọ.

31Mgbe Onyenwe anyị hụrụ na Lịa bụ nwanyị a kpọrọ asị, o meghere akpanwa ya, ma Rechel bụ nwanyị aga.

32Lịa tụrụ ime mụọ nwa nwoke, kpọọ ya Ruben. Nʼihi na o kwuru sị, “Ọ bụ nʼihi na Onyenwe anyị ahụla nsogbu m, ugbu a di m ga-ahụ m nʼanya.”

33Ọ tụụrụ ime ọzọ mụọkwa nwa nwoke. O kwuru sị, “Onyenwe anyị anụla na m bụ nwanyị a kpọrọ asị, ọ bụ ya mere o ji nye m nwa nwoke ọzọ.” Ya mere ọ kpọrọ aha ya Simiọn.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.