15Aga m eme ka iro dịrị nʼetiti gị na nwanyị ahụ, nʼetiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya, mkpụrụ ya ga-etipịa gị isi, gị onwe gị ga-ata ya arụ nʼikiri ụkwụ.”
16Ọ gwara nwanyị ahụ sị ya, “Aga m eme ka ihe mgbu nke ịmụ nwa gị baa ụba nke ukwuu, ọ bụ site nʼihe mgbu ka ị ga-eji mụpụta ụmụ gị. Ọchịchọ nke obi gị ga-adị nʼaka di gị, ọ bụ ya ga-achịkwa gị.”
17Ọ gwara Adam sị, “Nʼihi na ị ṅara nwunye gị ntị, rie mkpụrụ site nʼosisi ahụ m nyere gị iwu sị, ‘Gị erila mkpụrụ sitere na ya,’ “Ala bụ ihe a bụrụ ọnụ nʼihi gị, site nʼoke ndọgbu nʼọrụ ka ị ga-eri ihe si na ya pụta ogologo ụbọchị ndụ gị niile.
18Ọ ga-erupụtara gị ogwu na uke, ị ga-erikwa ahịhịa nke ubi.
19Site nʼọsụsọ nke ga-agbapụta gị nʼihu ka ị ga-eri nri gị tutu ruo mgbe ị lọghachiri nʼala ebe ọ bụ site nʼala ka e si mepụta gị nʼihi na aja ka ị bụ, nʼaja ka ị ga-alaghachikwa.”