17Chineke nụrụ olu Lịa, ọ tụụrụ ime mụtara Jekọb nwa nwoke nke ise.
18Lịa sịrị, “Chineke akwụọla m ụgwọ maka odibo m nwanyị m nyere di m.” Ya mere ọ kpọrọ aha ya Isaka.
19Lịa tụkwaara ime ọzọ mụtara Jekọb nwa nwoke nke isii.
20Ugbu a Lịa kwuru sị, “Chineke enyela m ezi onyinye dị oke ọnụ. Ugbu a, di m ga-eji nkwanye ugwu leta m nʼihi na amụọrala m ya ụmụ ndị ikom isii.” Ọ kpọrọ aha ya Zebụlọn.
21Emesịa, Lịa mụrụ nwa nwanyị, kpọọ ya Daịna.