1Rechel hụrụ na ya amụghị nwa ọbụla nye Jekọb, o kworo ekworo megide nwanne ya nwanyị. Ya mere, ọ sịrị Jekọb, “Nye m ụmụ. Ọ bụrụ na i meghị otu a, aga m anwụ.”
2Jekọb were iwe megide Rechel, sị ya, “Abụ m Chineke onye gbochiri gị mkpụrụ nke afọ?”
3Mgbe ahụ Rechel gwara Jekọb sị ya, “Lee odibo m nwanyị Bilha, bakwuru ya ka ọ mụọ nwa nʼikpere m abụọ, ka mụ onwe m site na ya bụrụkwa onye mụtara ụmụ.”
4Rechel nyere Jekọb Bilha, odibo nwanyị ya, Jekọb bakwuuru ya.