Jenesis 31

Gịnị mere i nyeghị m ohere ka m sutu ụmụ ụmụ m na ụmụ m ndị inyom ọnụ sị ha laa nke ọma? Omume a i mere bụ omume nzuzu.

Genesis 31:28 (UKJV) And have not suffered me to kiss my sons and my daughters? you have now done foolishly in so doing.

26Leban sịrị Jekọb, “Gịnị bụ ihe a i mere? Ị ghọgbuola m. I burula ụmụ m ndị inyom dịka ndị a dọtara nʼagha?

27Gịnị mere i ji ghọgbuo m, zoro ezo gbapụ? Gịnị mere ị gwaghị m ka m jiri ọṅụ na ịbụ abụ nke ya na ịkpọ ụbọ akwara na iti ịgba so, zilaga gị?

28Gịnị mere i nyeghị m ohere ka m sutu ụmụ ụmụ m na ụmụ m ndị inyom ọnụ sị ha laa nke ọma? Omume a i mere bụ omume nzuzu.

29Enwere m ike merụọ gị ahụ ugbu a, ma Chineke nke nna gị mere ka m hụ ya anya na nrọ nʼabalị gara aga. Ọ dọrọ m aka na ntị sị m, ‘Kpachapụ anya gị hụ na o nweghị ihe ị gwara Jekọb, maọbụ okwu dị mma, maọbụ nke dị njọ.’

30Ugbu a, ị na-ala nʼihi na ọ gụrụ gị agụụ ịlaghachi nʼụlọ nna gị, ma gịnị mere i ji zuru chi m?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.