2Jekọb hụkwara na omume Leban nʼebe ọ nọ adịghịkwa otu ọ dị na mbụ.
3Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Jekọb, “Laghachi nʼala nna gị ha, lakwuru ụmụnna gị, aga m anọnyere gị.”
4Ya mere, Jekọb ziri Rechel na Lịa ozi ka ha bịakwute ya nʼọhịa ebe ọ nọ na-elekọta igwe anụ ụlọ ya.
5Ọ sịrị ha, “Ahụla m na omume nna unu nʼebe m nọ adịghịkwa otu ọ dị na mbụ. Ma Chineke nna m ha nọnyeere m.
6Unu maara na eji m ike m niile rụọra nna unu ọrụ.