6Unu maara na eji m ike m niile rụọra nna unu ọrụ.
7Ma nna unu ghọgburu m, gbanwee ụgwọ ọrụ m ugboro iri. Otu ọ dị, Chineke ekweghị ka nna unu merụọ m ahụ.
8Ọ bụrụ na ọ sị, ‘Ndị tụrụ agwa agwa ga-abụ ụgwọ ọrụ gị,’ mgbe ahụ, igwe anụ ụlọ niile na-amụ ụmụ na-abụ ndị tụrụ agwa. Ma ọ bụrụ na ọ sị, ‘Ndị niile nwere ntụpọ ga-abụ ụgwọ ọrụ gị,’ mgbe ahụ, igwe anụ ụlọ niile na-amụ ụmụ na-enwe ntụpọ ọcha nʼahụ ha.
9Chineke napụrụ nna unu anụ ụlọ ya ma nye m ha.
10“Nʼoge ụmụ anụ ụlọ ji atụ ime, eweliri m anya hụ na nrọ na ụmụ mkpi niile na-agba igwe nne ewu bụ ụmụ mkpi ndị tụrụ agwa agwa, ndị nwere akara maọbụ ndị nwere ntụpọ ọcha nʼahụ ha.