Jenesis 32

Ekwesighị m obi ebere na ikwesi ntụkwasị obi nke i gosiri ohu gị. Mgbe m gabigara Jọdan a, enweghị m ihe ọbụla karịa mkpanaka m, ma ugbu a, abụ m ọmụma ụlọ ikwu abụọ.

Genesis 32:10 (UKJV) I am not worthy of the least of all the mercies, and of all the truth, which you have showed unto your servant; for with my staff I passed over this Jordan; and now I am become two bands.

8O chere nʼobi ya sị, “Ọ bụrụ na Ịsọ alụso otu nʼime ụzọ abụọ a ọgụ, otu ụzọ fọdụrụ ga-enwe ike gbalaga.”

9Mgbe ahụ, Jekọb kpere ekpere sị, “Chineke nke nna m Ebraham, Chineke nke nna m Aịzik, Onyenwe anyị, gị onye gwara m sị, ‘Laghachi nʼala gị na nʼebe ụmụnna gị nọ, aga m eme ka ihe gaara gị nke ọma.’

10Ekwesighị m obi ebere na ikwesi ntụkwasị obi nke i gosiri ohu gị. Mgbe m gabigara Jọdan a, enweghị m ihe ọbụla karịa mkpanaka m, ma ugbu a, abụ m ọmụma ụlọ ikwu abụọ.

11Zọpụta m, arịọ m gị, site nʼaka nwanne m Ịsọ, nʼihi na egwu na-atụ m na ọ ga-abịa lụso m agha, lụsokwa ndị nne a na ụmụntakịrị ha agha.

12Ọ bụ gị kwuru sị, ‘Aga m eme ka ihe gaara gị nke ọma, meekwa ka ụmụ ụmụ gị dịrị ka aja nke dị nʼọnụ osimiri, nke mmadụ na-apụghị ịgụta ọnụ.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.