12Ọ bụ gị kwuru sị, ‘Aga m eme ka ihe gaara gị nke ọma, meekwa ka ụmụ ụmụ gị dịrị ka aja nke dị nʼọnụ osimiri, nke mmadụ na-apụghị ịgụta ọnụ.’ ”
13Jekọb rahụrụ nʼebe ahụ nʼabalị ahụ. Site nʼihe niile o nwere, ọ họpụtara onyinye ọ ga-enye nwanne ya Ịsọ.
14Ọ kwadoro inye ya: narị nne ewu abụọ (200), iri mkpi abụọ (20), narị nne atụrụ abụọ (200), iri ebule abụọ (20)
15Iri nne ịnyịnya kamel atọ (30) na ụmụ ha, na iri nne ehi anọ (40), oke ehi iri (10), iri nne ịnyịnya ibu abụọ (20), oke ịnyịnya ibu iri (10).
16O weere onyinye ndị a niile nyefee nʼaka ndị ozi ya nʼusoro dịka ụdị ha si dị. Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi sị ha, “Burunu ụzọ na-aga, meenụ ka ohere dị nʼetiti igwe anụ na igwe ibe ya.”