15Iri nne ịnyịnya kamel atọ (30) na ụmụ ha, na iri nne ehi anọ (40), oke ehi iri (10), iri nne ịnyịnya ibu abụọ (20), oke ịnyịnya ibu iri (10).
16O weere onyinye ndị a niile nyefee nʼaka ndị ozi ya nʼusoro dịka ụdị ha si dị. Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi sị ha, “Burunu ụzọ na-aga, meenụ ka ohere dị nʼetiti igwe anụ na igwe ibe ya.”
17O nyere onye mbụ iwu sị ha, “Mgbe Ịsọ nwanne m zutere unu jụọ unu ajụjụ sị, ‘Onye bụ nna unu ukwu? Ebee ka unu na-aga? Onye nwe anụ ụlọ ndị a niile unu chị na-aga?’
18Unu ga-aza sị ya, ‘Anụ ụlọ ndị a bụ nke ohu gị Jekọb. Ha bụ onyinye e zitere onyenwe m Ịsọ, lee ka ọ na-abịa nʼazụ anyị.’ ”
19Otu ozi ahụ ka Jekọb ziri onye nke abụọ na onye nke atọ, na ndị ọzọ niile chị igwe anụ ụlọ, sị ha, “Unu ga-agwa Ịsọ otu ihe ahụ mgbe unu zutere ya.