23Mgbe ọ kpọfechara ha, o bufekwara ihe niile o nwere.
24Emesịa, Jekọb lọghachiri nọdụ naanị ya. Mgbe ahụ, otu nwoke bịara gbaso ya mgba. Ha abụọ gbagidere mgba a tutu chi ebido ịbọ.
25Mgbe nwoke ahụ hụrụ na ọ pụghị imeri Jekọb na mgba ahụ, o tiri Jekọb aka nʼọkpụ, mee ka ọkpụ ya hịkwapụ site nʼọnọdụ ya.
26Mgbe nke a mesịrị, nwoke ahụ gwara Jekọb sị ya: “Hapụ m aka ka m laa, nʼihi na chi ebidola ịbọ.” Ma Jekọb zara sị ya, “Ọ bụ naanị mgbe ị gọziri m ka m ga-ahapụ gị ka ị laa.”
27Mgbe ahụ nwoke ahụ jụrụ Jekọb ajụjụ sị ya, “Gịnị bụ aha gị?” Ọ zara sị, “Aha m bụ Jekọb.”