29Jekọb sịrị, “Biko gwa m aha gị.” Ma ọ zaghachiri, “Gịnị mere ị ji ajụ aha m?” Mgbe ahụ, ọ gọziri ya nʼebe ahụ.
30Jekọb kpọrọ aha ebe ahụ Peniel, nʼihi na ọ sịrị, “Ahụla m Chineke ihu na ihu, ma e chebere ndụ m.”
31Anyanwụ awaala mgbe Jekọb si Peniel gafee. Ma nʼihi ihe mere ya nʼọkpụ, ọ naghị agazikwa ije.
32Ọ bụ ihe a mere ụmụ Izrel adịghị eri akwara anụ jikọtara ukwu anụ na ọkpụ ya ruo taa. Nʼihi na ihe ahụ mere Jekọb metụtara akwara ukwu ya.