11Shekem gwara nna na ụmụnne Daịna ndị ikom sị, “Kwerenụ ka m chọta ihuọma nʼebe unu nọ, aga m enyekwa unu ihe ọbụla unu chọrọ ka m nye unu.
12Ihe ọbụla unu sị m kwụọ dịka ego akụ ọlụlụ nwunye, ya na onyinye ọbụla unu si m nye aga m enye unu. Naanị kwerenụ ka nwaagbọghọ a bụrụ nwunye m.”
13Ma ụmụ Jekọb jiri aghụghọ zaa Shekem na Hamọ nna ya mgbe ha na-agwa ha okwu, nʼihi na e merụrụ Daịna nwanne ha nwanyị.
14Ha sịrị ha, “Anyị enweghị ike ime ihe a, ị kpọrọ nwanne anyị nwanyị kpọnye nwoke a na-ebighị ugwu. Nke a ga-abụrụ anyị ihe ihere.
15Anyị nwere ike ikwenye ka ọ lụọ ya ma ọ bụrụ na unu ga-adị ka anyị, ka e bie ndị nwoke unu niile ugwu.