30ọnụmara Dishọn, ọnụmara Eza na ọnụmara Dishan. Ndị a niile bụ ndị ọnụmara Hor dịka nkewa ha si dị nʼala Sia.
31Ndị a bụ ndị eze chịrị nʼEdọm tupu ndị Izrel enwee eze mbụ ha.
32Bela, nwa Beoa chịrị dịka eze nʼEdọm. Isi obodo ya bụ Dinhaba.
33Mgbe Bela nwụrụ, Jobab nwa Zera onye Bozra nọchiri ya dịka eze.
34Mgbe Jobab nwụrụ, Husham onye si nʼala Teman nọchiri ya dịka eze.