32Ha chịịrị uwe mwụda ahụ nwere ọtụtụ agwa jekwuru nna ha sị ya, “Anyị hụrụ uwe a nʼime ọhịa. Leruo ya anya ka ị mara maọbụ uwe mwụda nwa gị.”
33Ọ matara na ọ bụ ya, sị, “E, nke a bụ uwe nwa m nwoke. Ajọ anụ eriela ya. Anụ ọhịa adọkasịala Josef nʼezie.”
34Mgbe ahụ, Jekọb dọwara uwe ya, yiri akwa mkpe, ruo ụjụ ọtụtụ ụbọchị nʼihi nwa ya.
35Ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom niile bịara ịkasị ya obi, ma ọ jụrụ ịnabata nkasiobi ọbụla. Ọ sịrị, “Aga m alakwuru nwa m nʼala mmụọ site nʼiru ụjụ.” Nna ya kwagidere akwa nʼihi ya.
36Ugbu a, ndị Midia ahụ rere Josef nʼIjipt, resi ya Pọtifa, otu nʼime ndịisi na-ejere Fero ozi, onye bụ onyeisi ndị nche Fero, bụ eze Ijipt.