Jenesis 38

Mgbe ọtụtụ oge gasịrị, nwunye Juda nwa Shua nwụrụ. Mgbe oge nkasiobi ya gasịrị, Juda jere Timna, ya na enyi ya Hira, onye Adulam, ilekọta ndị na-akpụchapụ igwe ewu na atụrụ ya ajị.

Genesis 38:12 (UKJV) And in process of time the daughter of Shuah Judah's wife died; and Judah was comforted, and went up unto his sheepshearers to Timnath, he and his friend Hirah the Adullamite.

10Ma ihe a o mere jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. Nʼihi ya Onyenwe anyị gbukwara ya.

11Juda sịrị nwunye nwa ya, bụ Tama, “Laa nʼụlọ nna gị nọrọ dịka nwanyị di ya nwụrụ tutu Shela nwa m nwoke etoo.” Ma echiche ya bụ, “ka ọ ghara ịnwụ dịka ụmụnne ya.” Tama lara gaa biri nʼụlọ nna ya.

12Mgbe ọtụtụ oge gasịrị, nwunye Juda nwa Shua nwụrụ. Mgbe oge nkasiobi ya gasịrị, Juda jere Timna, ya na enyi ya Hira, onye Adulam, ilekọta ndị na-akpụchapụ igwe ewu na atụrụ ya ajị.

13A gwara Tama sị ya, “Nna di gị na-aga Timna ịkpacha atụrụ ya ajị.”

14O yipụrụ uwe mkpe ya, were akwa mkpuchi kpuchie onwe ya gaa nọdụ ala nʼọnụ ụzọ ama Enayim, nke dị nʼụzọ e si aga Timna. O mere otu a nʼihi na ọ matara na Shela etoola, ma enyeghị ya ka ọ bụrụ nwunye ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.