26Juda ghọtara ha, sị, “Ọ bụ onye ezi omume karịa m, ebe ọ bụ na m jụrụ ịkpọrọ ya kpọnye nwa m nwoke Shela ka ọ bụrụ nwunye ya.” O dinakwaghị ya ọzọ.
27Mgbe oge ọmụmụ nwa ya ruru, ejima ka ahụrụ nʼakpanwa ya.
28Mgbe ọ na-amụ ha, otu nʼime ha sepụtara aka ya. Nwanyị na-aghọ nwa weere eriri na-acha uhie uhie kee ya na nkwoji aka kwuo sị, “Ọ bụ nke a bụ ụzọ pụta.”
29Ma nwa ahụ mesịrị sekpuo aka ya, nwanne ya nke ọzọ eburu ya ụzọ pụta. Nwanyị ahụ sịrị, “Ọ bụ otu a ka ị si tikapụta?” A kpọrọ ya Perez.
30Emesịa, nwanne ya, nke bu eriri uhie uhie ahụ na nkwoji aka pụtakwara. A kpọrọ ya Zera.