6Ya mere, ọ hapụrụ ihe niile o nwere nʼaka Josef. Nke a mere na ọ mazighị ihe ọzọ na-eme, ma ọ bụghị nri nke ọ na-eri. Josef nʼonwe ya mara mma ahụ dịkwa mma ile anya.
7Mgbe oge nta gasịrị, nwunye Pọtifa lere Josef anya sị ya, “Bịa ka anyị abụọ dinaa.”
8Ma Josef jụrụ. Ọ gwara nwunye nna ya ukwu sị, “Lee, nna m ukwu anaghị echegbu onwe ya banyere ihe ọbụla nʼụlọ a. O werela ihe niile o nwere nyefee m nʼaka ka m lekọta ha anya.
9O nweghị onye ọnọdụ ya dị elu karịa nke m nʼụlọ a. O gbochighị m ihe ọbụla ma ọ bụghị gị, nʼihi na ị bụ nwunye ya. Olee otu m ga-esi mee oke ihe ọjọọ dị otu a, mee mmehie megide Chineke.”
10Ọ bụ ezie na nwanyị a nọgidere na-enye Josef nsogbu site nʼụbọchị ruo ụbọchị ma Josef jụrụ iso ya dinaa, jụkwa ịnọnyere ya.