6Ma Onyenwe anyị jụrụ ya sị, “Gịnị mere i ji ewe iwe? Gịnị mere ihu gị ji gbarụọ?
7Ọ bụrụ na i mee ihe ziri ezi, agaghị anabata gị? Ọ bụrụkwanụ na ị jụ ime ihe ziri ezi, mmehie nọ nʼọnụ ụzọ na-eche gị ịla gị nʼiyi. Lezie anya hụ na i meriri ya.”
8Ken gwara nwanne ya Ebel sị, “Bịa soro m ka anyị banye ọhịa.” Mgbe ha nọ nʼebe ahụ, Ken jidere nwanne ya gbuo ya.
9Emesịa, Onyenwe anyị jụrụ Ken ajụjụ sị, “Ebee ka Ebel nwanne gị nwoke nọ?” Ọ zaghachiri, “Amaghị m. Abụ m onye nche nwanne m?”
10Ma Onyenwe anyị zara sị ya, “Gịnị ka i mere? Gee ntị, ọbara nwanne gị na-akpọku m site nʼala.