9Onyeisi ndị na-ebu iko kọọrọ Josef nrọ ya. Ọ sịrị ya, “Arọrọ m nrọ hụ osisi vaịnị nʼihu m.
10Osisi vaịnị a nwere alaka atọ. Mgbe m nọ na-ele anya, osisi vaịnị ahụ mara ifuru, mịpụta mkpụrụ nʼụyọkọ nʼụyọkọ, ha chakwaa.
11Ebe ọ bụ nʼiko Fero dị m nʼaka, a ghọọrọ m mkpụrụ vaịnị ndị a, pịpụta mmiri ha pịnye nʼime iko mmanya Fero, bunye ya ka ọ ṅụọ.”
12Josef sịrị ya, “Nke a bụ ihe nrọ gị pụtara. Alaka atọ ahụ bụ abalị atọ.
13Nʼime abalị atọ Fero ga-akpọpụta gị, mee ka i nwere onwe gị. Fero ga-enyeghachikwa gị ọrụ gị. Ị ga-etinyekwa Fero iko ya nʼaka dịka i si eme na mbụ mgbe ị bụ onye na-ebu iko ya.