Jenesis 40

Nʼihi ya, ọ jụrụ ndị ozi Fero ndị a ha na ya nọ nʼụlọ mkpọrọ dị nʼụlọ nna ya ukwu sị ha, “Gịnị mere ihu unu ji gbarụọ taa?”

Genesis 40:7 (UKJV) And he asked Pharaoh's officers that were with him in the ward of his lord's house, saying, Wherefore look all of you so sadly to day?

5Ha abụọ, onye ahụ na-esiri eze nri, na onye na-ebu iko eze Ijipt, rọrọ nrọ nʼotu abalị. Nrọ nke onye ọ bụla nwere nkọwa nke ya.

6Mgbe chi bọrọ, Josef bịakwutere ha hụ na ihu ha gbarụrụ agbarụ.

7Nʼihi ya, ọ jụrụ ndị ozi Fero ndị a ha na ya nọ nʼụlọ mkpọrọ dị nʼụlọ nna ya ukwu sị ha, “Gịnị mere ihu unu ji gbarụọ taa?”

8Ha zara sị ya, “Anyị rọrọ nrọ ọjọọ, ma onye nkọwa ya adịghị.” Josef sịrị ha, “Ọ bụghị Chineke nwee ike ịkọwa nrọ? Kọọrọnụ m ha.”

9Onyeisi ndị na-ebu iko kọọrọ Josef nrọ ya. Ọ sịrị ya, “Arọrọ m nrọ hụ osisi vaịnị nʼihu m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.