24Ma ọka ndị a fịkpọrọ afịkpọ lodara ọka asaa ndị ahụ mara mma. Akọọlara m ndị majiki ihe ndị a, ma ọ dịghị onye nʼime ha nwere ike ịkọwara m ihe nrọ ndị a pụtara.”
25Mgbe ahụ, Josef sịrị Fero, “Nrọ abụọ Fero rọrọ pụtara otu ihe. Chineke esitela na nrọ ndị a gwa Fero ihe ọ na-aga ime.
26Ehi asaa ndị ahụ buru ibu bụ afọ asaa. Ogbe ọka asaa ndị ahụ buru ibu bụkwa afọ asaa. Ọ bụ otu nrọ ahụ, ọ bụ ezie na ị rọrọ ya ugboro abụọ.
27Ehi asaa ndị ọzọ ahụ dị ọkpụkpụ ọkpụkpụ ndị pụtara mgbe ndị nke mbụ pụtachara bụ afọ asaa. Otu a kwa ogbe ọka ndị ọzọ fịkpọrọ afịkpọ nke ikuku si nʼọwụwa anyanwụ mere ka ha fịkpọọ bụ afọ asaa. Ha na-egosi afọ asaa mgbe oke ụnwụ ga-adị.
28“Dịka m gwara Fero na mbụ, Chineke egosila gị ihe ọ chọrọ ime.