1Ma ụnwụ a siri oke ike nʼala ahụ nʼoge a.
2O ruo, mgbe ha richara nri ha zụtara nʼIjipt, nna ha gwara ha sị, “Jeghachinụ, zụtara anyị ntakịrị nri.”
3Juda gwara nna ya bụ Jekọb sị, “Nwoke ahụ dọsiri anyị aka na ntị ike sị, ‘Unu agaghị ahụ ihu m ma ọ bụrụ na nwanne unu esoghị unu bịa.’