13Ngwa, kpọrọnụ nwanne unu nwoke bilienụ laghachikwurunụ nwoke ahụ.
14Ka Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, mee ka nwoke ahụ nwee obi ebere nʼebe unu nọ. Ya meekwa ka o nwee ike ịhapụrụ unu nwanne unu Simiọn na Benjamin ka ha soro unu lọta. Ọ bụrụkwanụ uche Chineke na m ga-agbara aka ụmụ, ya mee dịka o si chọọ.”
15Ya mere, ndị ikom ahụ weere onyinye ndị a, na okpukpu ego abụọ nʼaka, ma kpọrọkwa Benjamin. Ha biliri ije. Garuo Ijipt, ma guzo nʼihu Josef.
16Mgbe Josef lepụrụ anya hụ Benjamin nʼetiti ha, ọ gwara onye na-elekọta ụlọ ya sị, “Duru ndị ikom ndị a gaa nʼụlọ. Gbuo anụ, kwadoo nri, nʼihi na ndị a ga-eso m rie nri ehihie.”
17Odibo a mere dịka Josef ziri ya. O duuru ndị ikom ndị ahụ gaa nʼụlọ Josef.