6Mgbe ahụ Izrel sịrị, “Gịnị mere unu ji wetara m nsogbu dị otu a, site nʼịgwa nwoke ahụ na unu nwere nwanne ọzọ.”
7Ha zara sị, “Nwoke a jụrụ anyị ajụjụ dị iche iche banyere onwe anyị, na ndị ezinaụlọ anyị. Ọ sị, ‘Nna unu, ọ dị ndụ ugbu a? Unu nwere nwanne ọzọ?’ Ya mere, anyị zara ajụjụ niile. O nweghị otu anyị siri mara na ọ ga-asị anyị kpọta nwanne anyị.”
8Mgbe ahụ, Juda sịrị nna ya Izrel, “Dunye m nwantakịrị a ka anyị bilie gawa, ka anyị dị ndụ ghara ịnwụ, ma anyị onwe anyị, ma gị, ma ụmụntakịrị anyị.
9Aga m eji onwe m gbaa ebe nʼihi ya. I nwere ike itife ya nʼaka m. Ọ bụrụ na m akpọtaghachighị ya, kpọbata ya nʼihu gị, mgbe ahụ, ịta ụta bụrụ nke m nʼihu gị, nʼụbọchị ndụ m niile.
10A sị nnọọ na anyị egbughị oge niile a, anyị gaara aga ma lọtakwarị ugboro abụọ.”